12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
13Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
14Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.