11“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.
12Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.
13Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”
14Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”