18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.
22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala nʼihi ajọ omume gị niile.