16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara
17Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.