14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
15“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara
17Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’