6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’
9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”
10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.