4Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.
5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”
6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’