Jeremaya 23

Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’

Jeremiah 23:17 (UKJV) They say still unto them that despise me, The LORD has said, All of you shall have peace; and they say unto every one that walks after the imagination of his own heart, No evil shall come upon you.

15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”

16Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha

17Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’

18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?

19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.