22A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
23“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
24“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?