29“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
30Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.
31E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
32Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
33“Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’