31E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
32Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
33“Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’
34Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.
35Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’