Jeremaya 23

Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.

Jeremiah 23:34 (UKJV) And as for the prophet, and the priest, and the people, that shall say, The burden of the LORD, I will even punish that man and his house.

32Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33“Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’

34Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.

35Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’

36Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.