Jeremaya 23

Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.

Jeremiah 23:39 (UKJV) Therefore, behold, I, even I, will utterly forget you, and I will forsake you, and the city that I gave you and your fathers, and cast you out of my presence:

37Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’

38Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’

39Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.

40Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.