Jeremaya 23

Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”

Jeremiah 23:40 (UKJV) And I will bring an everlasting reproach upon you, and a perpetual shame, which shall not be forgotten.

38Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’

39Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.

40Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.