Jeremaya 24

Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.

Jeremiah 24:1 (UKJV) The LORD showed me, and, behold, two baskets of figs were set before the temple of the LORD, after that Nebuchadrezzar king of Babylon had carried away captive Jeconiah the son of Jehoiakim king of Judah, and the princes of Judah, with the carpenters and smiths, from Jerusalem, and had brought them to Babylon.

1Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.

2Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.