Jeremaya 24

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Jeremiah 24:4 (UKJV) Again the word of the LORD came unto me, saying,

2Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”

4Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

5“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.

6Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.