Jeremaya 24

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.

Jeremiah 24:5 (UKJV) Thus says the LORD, the God of Israel; Like these good figs, so will I acknowledge them that are carried away captive of Judah, whom I have sent out of this place into the land of the Chaldeans for their good.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”

4Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

5“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.

6Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.

7Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.