Jeremaya 25

Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”

Jeremiah 25:16 (UKJV) And they shall drink, and be moved, and be mad, because of the sword that I will send among them.

14A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”

15Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.

16Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”

17Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.

18Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.