16Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
17Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
18Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
19Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
20na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.