29Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
30“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “ ‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
31Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
32Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
33Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.