31Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
32Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
33Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
34Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
35Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.