Jeremaya 25

Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.

Jeremiah 25:38 (UKJV) He has forsaken his covert, as the lion: for their land is desolate because of the fierceness of the oppressor, and because of his fierce anger.

36Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.

37Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.

38Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.