Jeremaya 26

Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Jeremiah 26:9 (UKJV) Why have you prophesied in the name of the LORD, saying, This house shall be like Shiloh, and this city shall be desolate without an inhabitant? And all the people were gathered against Jeremiah in the house of the LORD.

7Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile.

8Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ!

9Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

10Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

11Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.