Jeremaya 28

Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.

Jeremiah 28:10 (UKJV) Then Hananiah the prophet took the yoke from off the prophet Jeremiah's neck, and brake it.

8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.

9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”

10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.

11Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.

12Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.