9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”
10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.
11Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.
12Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
13“Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe.