6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn.
7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a.
8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche.
9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”
10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya.