2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.
3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn.
4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị
6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn.