1O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m.
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.
3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn.
4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.