Jeremaya 29

Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.

Jeremiah 29:2 (UKJV) (After that Jeconiah the king, and the queen, and the eunuchs, the princes of Judah and Jerusalem, and the carpenters, and the smiths, were departed from Jerusalem;)

1Ihe ndị a bụ ihe dị nʼakwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jerusalem degaara ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị okenye, na ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị Izrel Nebukadneza dọtara nʼagha si na Jerusalem bulaa ha Babilọn.

2Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.

3Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.

4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.