Jeremaya 29

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn,

Jeremiah 29:4 (UKJV) Thus says the LORD of hosts, the God of Israel, unto all that are carried away captives, whom I have caused to be carried away from Jerusalem unto Babylon;

2Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.

3Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.

4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn,

5“Wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya; kụọnụ ihe nʼubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya;

6lụọnụ nwunye, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; lụọkwaranụ ụmụ unu ndị ikom nwunye, kwenyekwanụ ka ụmụ unu ndị inyom lụọ di, ka ha mụọkwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mụbaanụ nʼebe ahụ, unu ebilatakwala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.