Jeremaya 29

Nʼihi ha, ndị niile e si Juda dọta nʼagha buru gaa Babilọn ga na-ekwu okwu nkọcha sị, ‘Ka Onyenwe anyị mesokwa gị ụdị mmeso o mesoro Zedekaya na Ehab, ndị eze Babilọn tụnyere nʼọkụ nke regburu ha.’

Jeremiah 29:22 (UKJV) And of them shall be taken up a curse by all the captivity of Judah which are in Babylon, saying, The LORD make you like Zedekiah and like Ahab, whom the king of Babylon roasted in the fire;

20Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.

21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu banyere Ehab nwa Kolaya, na Zedekaya nwa Maaseia, ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m, “Aga m ewere ha nyefee nʼaka Nebukadneza bụ eze Babilọn. Ọ ga-etigbukwa ha nʼihu unu.

22Nʼihi ha, ndị niile e si Juda dọta nʼagha buru gaa Babilọn ga na-ekwu okwu nkọcha sị, ‘Ka Onyenwe anyị mesokwa gị ụdị mmeso o mesoro Zedekaya na Ehab, ndị eze Babilọn tụnyere nʼọkụ nke regburu ha.’

23Nʼihi na ha emeela ihe ndị jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel; ha na nwunye ndị agbataobi ha akwaala iko; ha esitekwala nʼaha m buo amụma ụgha, amụma nke m na-enyeghị ha iwu ibu. Amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu, nʼihi na ahụrụ m ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

24Gwa Shemaya onye Nehelam okwu sị ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.