Jeremaya 29

Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.

Jeremiah 29:20 (UKJV) Hear all of you therefore the word of the LORD, all you of the captivity, whom I have sent from Jerusalem to Babylon:

18Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.

19Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

20Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.

21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu banyere Ehab nwa Kolaya, na Zedekaya nwa Maaseia, ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m, “Aga m ewere ha nyefee nʼaka Nebukadneza bụ eze Babilọn. Ọ ga-etigbukwa ha nʼihu unu.

22Nʼihi ha, ndị niile e si Juda dọta nʼagha buru gaa Babilọn ga na-ekwu okwu nkọcha sị, ‘Ka Onyenwe anyị mesokwa gị ụdị mmeso o mesoro Zedekaya na Ehab, ndị eze Babilọn tụnyere nʼọkụ nke regburu ha.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.