Jeremaya 29

O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ”

Jeremiah 29:28 (UKJV) For therefore he sent unto us in Babylon, saying, This captivity is long: build all of you houses, and dwell in them; and plant gardens, and eat the fruit of them.

26‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.

27Gịnị mere i ji hapụ ịbasiri Jeremaya, onye Anatot mba ike, onye na-eme onwe ya onye amụma nʼetiti unu?

28O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ”

29Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.

30Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.