Jeremaya 29

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,

Jeremiah 29:30 (UKJV) Then came the word of the LORD unto Jeremiah, saying,

28O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ”

29Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.

30Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,

31“Zigara ndị ahụ niile e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ ozi sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shemaya onye Nehelam, Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma mee ka unu tụkwasị obi unu nʼokwu ụgha ya, ma ọ bụghị m ziri ya,

32ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.