22“Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.
23Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
24Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.
25Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”