22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”
23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.
24Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.