Jeremaya 30

‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”

Jeremiah 30:22 (UKJV) And all of you shall be my people, and I will be your God.

20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.

21Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

22‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ”

23Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya mee ka oke ifufe ya fee. Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu dịka ifufe na-efesi ike.

24Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị tutu ruo mgbe o mezuru ihe ndị o bu nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa unu ga-aghọta ihe ndị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.