Jeremaya 31

Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.

Jeremiah 31:17 (UKJV) And there is hope in yours end, says the LORD, that your children shall come again to their own border.

15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”

16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.

17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.

18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

19Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.