Jeremaya 31

“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

Jeremiah 31:18 (UKJV) I have surely heard Ephraim bemoaning himself thus; You have chastised me, and I was chastised, as a bullock is not accustomed to the yoke: turn you me, and I shall be turned; for you are the LORD my God.

16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.

17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.

18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

19Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’

20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.