Jeremaya 31

Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 31:20 (UKJV) Is Ephraim my dear son? is he a pleasant child? for since I spoke against him, I do earnestly remember him still: therefore my bowels are troubled for him; I will surely have mercy upon him, says the LORD.

18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

19Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’

20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.

22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.