Jeremaya 31

“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’

Jeremiah 31:29 (UKJV) In those days they shall say no more, The fathers have eaten a sour grape, and the children's teeth are set on edge.

27Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.

28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’

30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.

31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.