26Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
27Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.
28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.