Jeremaya 31

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Jeremiah 31:35 (UKJV) Thus says the LORD, which gives the sun for a light by day, and the ordinances of the moon and of the stars for a light by night, which divides the sea when the waves thereof roar; The LORD of hosts is his name:

33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”

37Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe niile ha mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.