13“Nʼihu ha, enyere m Baruk iwu ndị a sị ya,
14‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge.
15Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’
16“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,
17“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime.