15Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’
16“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,
17“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime.
18Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị.
19Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị.