Jeremaya 32

Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị.

Jeremiah 32:19 (UKJV) Great in counsel, and mighty in work: for yours eyes are open upon all the ways of the sons of men: to give every one according to his ways, and according to the fruit of his doings:

17“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime.

18Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị.

19Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị.

20Ọ bụ gị mere ihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche nʼIjipt. Ị nọgidekwara na-arụ ha ruo taa, ma nʼala Izrel ma nʼetiti ndị niile nọ nʼụwa. Nʼihi ya, i meere onwe gị aha nke ka bụkwa nke gị nʼebe niile.

21Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.