1Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza.
2Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda.
3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.
4Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,
5onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”