Jeremaya 32

onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”

Jeremiah 32:5 (UKJV) And he shall lead Zedekiah to Babylon, and there shall he be until I visit him, says the LORD: though all of you fight with the Chaldeans, all of you shall not prosper.

3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.

4Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,

5onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”

6Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

7Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.