Jeremaya 32

“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.

Jeremiah 32:8 (UKJV) So Hanameel mine uncle's son came to me in the court of the prison according to the word of the LORD, and said unto me, Buy my field, I pray you, that is in Anathoth, which is in the country of Benjamin: for the right of inheritance is yours, and the redemption is yours; buy it for yourself. Then I knew that this was the word of the LORD.

6Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

7Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’

8“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.

9Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ.

10Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.