1Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:
3‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’